Luke 1:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ zara ya sị, “Aha m bụ Geburel. Ọ bụ nꞌihu Chineke, onye zitere m iwetara gị akụkọ ọma a ka m na-anọ ụbọchị nile.
Igbo 2006
Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mu onwem bu Gebriel, onye nēguzo n'iru Chineke; ezite-kwa-ram igwa gi okwu, na izì gi ozi ọma ndia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a.