Luke 1:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị ahụ dere ihe a, dere gwa anyị ihe ha hụrụ na nke ha nụrụ site nꞌọnụ ndị ji anya ha hụ ihe ndị a mgbe ha mezuru. Ha dekwara ihe ha nụrụ site nꞌọnụ ndị ozi Jisọs ndị kwusara ozi ọma ahụ.
Igbo 2006
ha dere ihe ndi mbu ji anya ha hu ihe ndia burukwa ndi na-ekwuputa ozioma, gwara ayi,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dị ka e nyefere ha nʼaka anyị idebe bụ ndị ahụ sitere na malite jiri anya ha hụ ihe niile, ndị jikwa okwu a eje ozi.