Luke 1:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Geekwa ntị ka m gwa gị! Ebe ị jụrụ ikwenye nꞌihe m gwara gị, a ga-anapụ gị ike ikwu okwu. Ị gaghị ekwukwa okwu ọ bụla, tutuu ruo mgbe okwu a m gwara gị mezuru. Nꞌihi na okwu a m gwara gị ga-emezu mgbe oge ya ruru.”
Igbo 2006
Le kwa, i gēkpuchi ọnu, i gaghi-apu kwa ikwu okwu, rue ubọchi ahu mb͕e ihe ndia gēme, n'ihi na i kweghi okwum ndia, nke gēmezu n'oge-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.”