Luke 1:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mmụọ ozi ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke ga-abịakwasị gị, ike Chineke ga-ekpuchikwa gị. Mgbe ahụ nwa ahụ ị ga-amụ ga-abụ onye dị nsọ. A ga-akpọkwa ya Ọkpara Chineke.
Igbo 2006
Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke.