Luke 1:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Akụkọ a bidoro nꞌoge eze Herọd na-achị ala Judia nile. Nꞌoge ahụ kwa, e nwere otu onye nchụaja ndị Juu a na-akpọ Zakaraya. O so nꞌotu ndị nchụaja a na-akpọ Abaija. Otu a na-ejekwa ozi nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem. Zakaraya nwere nwụnye aha ya bụ Elizabet, onye a mụkwara nꞌezinụlọ ndị nchụaja.
Igbo 2006
N'ubọchi Herod, eze Judia, otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n'òtù obodo Abaija puta: o nwe-kwa-ra nwunye nke si n'etiti umu-nwanyi Eron puta; aha nwayi ahu bu Elizabet.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn.