Luke 1:59 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe nwa ọhụrụ ahụ nọzuru abalị asatọ, ndị ikwu ha nile na ndị enyi ha bịara, nꞌihi na ọ bụ nꞌụbọchị ahụ ka a ga-agụ nwa ọhụrụ ahụ aha. Dị ka omenala si dị, ndị ahụ bịara abịa kpebiri na a ga-agụ ya Zakaraya, nke bụkwa aha nna ya.
Igbo 2006
O we rue n'ubọchi nke-asato, na ha biara ibi nwatakiri ahu úgwù; ha we kpọbá ya Zakaraias, n'aha nna-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya,