Luke 10:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
‘Anyị na-ehichapụ aja obodo a nyapagidere anyị nꞌụkwụ, na-ahapụrụ unu ya. Matakwanụ nꞌeziokwu na alaeze Chineke abịala unu nso.’
Igbo 2006
Ọbuná ájá si n'obodo-unu, nke rakuru n'ukwu-ayi, ka ayi nēhichapu imegide unu: otú ọ di, maranu nka, na ala-eze Chineke di nso.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
‘Ọ bụladị aja si nʼobodo a nke nyapagidere nʼụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ntị nye gị. Otu ọ dị, matakwanụ nke a, na alaeze Chineke dị nso.’