Luke 10:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ahụhụ dị ukwuu na-eche gị, gị obodo Korazin. Ahụhụ dị ukwuu dịkwa na-eche gị, gị obodo Betsaida. Nꞌihi na a sị na m rụrụ ọrụ nile m rụrụ nꞌime unu nꞌobodo Taịa na Saidọn, ha gaara echegharị kemgbe. Ha gaara eyi uwe nkịkara, wụkwasị onwe ha ntụ nꞌisi igosi na ha esitela na mmehie ha chegharịa.
Igbo 2006
Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon, nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga, nānọdu n'ákwà-nkpe na ntu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịrị gị Betsaida. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ebube a rụrụ nʼime unu ka a rụrụ na Taịa na Saịdọn ha gaara echegharị ogologo oge, nọdụ nʼakwa mkpe na ntụ.