Luke 10:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ, Jisọs, onye jupụtara nꞌọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuru okwu sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ekelee m gị nꞌihi na i zonarịrị ihe ndị a nꞌebe ndị ọkachamara na ndị ukwu nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a nile nye ndị na-amaghị ihe ọ bụla. Ee, Nna, ọ bụ gị siri otu a mee ya, nꞌihi na otu ahụ bụ ụzọ i siri chọọ ya.
Igbo 2006
N'oge hour ahu tọrọ Ya utọ nke-uku nime Mọ Nsọ, O we si, Ekelem Gi, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: e, Nna; ekelem Gi na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.