Luke 10:30 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zara sị, “Ọ dị otu nwoke sitere nꞌobodo Jerusalem na-aga nꞌobodo Jeriko. Mgbe ọ na-aga nꞌụzọ, o zutere ndị ohi na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike, ndị napụrụ ya ihe nile o nwere, tie ya ihe, hapụ ya nꞌọnọdụ ọdịndụ ọnwụkamma laa.
Igbo 2006
Jisus zara ya, si, Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n'etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ya, “Otu nwoke sitere Jerusalem na-aga Jeriko, ọ dabara nʼaka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe, hapụ ya nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma laa.