Luke 10:31 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja nke ụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem sitere ụzọ ahụ na-aga njem ya. Mgbe ọ hụrụ nwoke a, o sitere nꞌakụkụ ụzọ ahụ gafee.
Igbo 2006
Ma n'otù mb͕e ahu otù onye-nchu-àjà nārida n'uzọ ahu: mb͕e ọ huru ya, o we si n'akuku uzọ ọzọ gabiga.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja sitere ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ ya, o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafee.