Luke 10:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O sitere nꞌelu inyinya ibu ya rịdata, gaa nso nꞌebe nwoke ahụ dina. O ji mmanya saa ọnya ya, tee ya mmanụ, were akwa kechie ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o buliri nwoke ahụ elu, tụkwasị ya nꞌelu inyinya ibu ya, buru ya gaa nꞌụlọ ndị ije, ebe ọ nọ lekọtazie ya anya nke ọma.
Igbo 2006
o we biakute ya, ke ọnyá nile ya, wukwasi ha manu na manya-vine; o we tukwasi ya n'anu-ulo nke aka ya, dubata ya n'ulo ndi-ọbìa, we le ya anya nke-ọma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gara nso nʼebe ọ nọ, jiri mmanya na mmanụ wụsa nʼọnya ya, were akwa kechie ya. Ọ tụkwasịrị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buba ya nʼụlọ ndị ije ebe o lekọtara ya anya nke ọma.