Luke 10:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌechi ya, mgbe ọ na-akwado ịpụ, o wepụtara naịra abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie nwoke a anya nke ọma. Ọ bụrụ na i mefuo ego ọzọ karịrị ego a m nyere gị, mgbe m lọghachiri, aga m akwụ gị ya.’ ”
Igbo 2006
N'echi-ya o we tuputa shilling abua, nye onye-nwe ulo ndi-ọbìa ahu, si, Le ya anya nke-ọma; ihe ọ bula i n'akuku uzọ kari, mu onwem, mb͕e m'latara, m'gākwughachi gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.’