Luke 10:40 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a na-eme, Mata nọrị na-agbalị ikwado nri Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ga-eri. Ọ dịghị anya ọrụ a bidoro ịgbakasị ya ahụ nꞌihi na ọ bụ ọrụ dị ukwuu. Mgbe Mata na-enweghị ike idi ịrụ ọrụ a nanị ya, ọ pụtara jụọ Jisọs sị, “Onyenwe m, ọ̀ dị mma na Meri ga-ahapụrụ nanị m ọrụ ndị a nile? Gwanụ ya ka ọ bịa nyere m aka.”
Igbo 2006
Ma uche Mata nābasasi n'ije-ozi nke-uku; o we biakute Ya ọsọsọ, si, Onye-nwe-ayi, ò metughi Gi n'obi na nwa-nnem nwanyi nārapum ka nání mu nēje ozi? ya mere, gwa ya ka o yerem aka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.”