Luke 10:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Mgbe unu batara nꞌobodo ọ bụla, unu esitela nꞌotu ụlọ gaa na nke ọzọ. Nọdụnụ nꞌotu ebe rie ma ṅụọkwa ihe ha nyere unu, nꞌihi na onye ọrụ ọ bụla kwesịrị ịnata ụgwọ ọrụ ya.
Igbo 2006
Nọgide-kwa-nu n'ulo ahu, nēri nāṅu kwa ihe ha nēnye umu: n'ihi na onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya. Unu esila n'otù ulo ba n'ulo ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nọgidenụ nʼebe ahụ, na-erinụ ma na-aṅụkwanụ ihe ọbụla ha nyere unu, nʼihi na onye ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya. Unu esitela nʼotu ụlọ gaa nʼụlọ ọzọ.