Luke 11:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs onye maara ihe ha na-eche nꞌobi ha gwara ha okwu sị, “Obodo ọ bụla ịlụ ọgụ dị nꞌime ya agaghị adịgide ruo mgbe tere anya, ezinụlọ ọ bụla kwa nkewa na ịlụ ọgụ dị nꞌime ya, enweghị ike ịnọkọta.
Igbo 2006
Ma ebe Ya onwe-ya matara èchìchè-uche nile ha, Ọ si ha, Ala-eze ọ̀ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; ulo nke kewakwara megide ulo nāda.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ebe ọ bụ na ọ maara ihe ha na-eche, ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla kewaranụ megide ibe ya, ga-atọgbọrọ nʼefu, ezinaụlọ ọbụla nke kewakwara megide ibe ya ga-adakpọ.