Luke 11:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụ na m sitere nꞌike ekwensu achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ site nꞌike onye ka ụmụ unu ji achụpụ ndị ha na-achụpụ? Ya mere, ọ bụ ndị na-eso ụzọ unu ga-ezi unu na okwu unu erijughị afọ.
Igbo 2006
Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ike onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ọ bụrụ na m sitere nʼike Belzebub na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ site nʼike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe unu.