Luke 11:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Mgbe ọ bụla mmụọ ọjọọ si nꞌime mmadụ pụọ, mmụọ ọjọọ ahụ na-ejegharị nꞌala akọrọ na-achọgharị ebe ọ ga-ezu ike. Ọ bụrụ na mmụọ ọjọọ ahụ achọtaghị ebe izuike, ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alaghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’
Igbo 2006
Mb͕e ọ bula mọ nādighi ọcha siri n'aru madu pua, ọ nāgabiga n'ebe miri nādighi nāchọ izu-ike: ma ebe ọ dighi-achọta ya, ọ si, M'gālaghachi n'ulom ebe m'siri puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe ọbụla mmụọ na-adịghị ọcha sị nʼime mmadụ pụọ, ọ na-ejegharị nʼala kpọrọ nkụ na-achọgharị ebe izuike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị ya, mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m hapụrụ.’