Luke 11:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs kpụ okwu a nꞌọnụ, otu nwanyị nọ nꞌime igwe mmadụ ahụ tiri mkpu sị, “Chineke gọzie nne gị, onye mụrụ gị na onye nyere gị ara!”
Igbo 2006
O we rue, mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, na otù nwanyi si n'etiti ìgwè madu ahu weli olu-ya, si Ya, Ngọzi nādiri afọ nke buru Gi, na ara nke I miri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.”