Luke 11:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọtụtụ mmadụ na-abịa, na-agba Jisọs gburugburu, Jisọs gwara ha sị, “Ndị ọgbọ a bụ nnọọ ndị ọjọọ. Ha nọgidesịrị ike na-arịọ m ka m meere ha ihe ịrịba ama nke ga-egosi ha na m bụ Onye nzọpụta. Ma ọ dịghị ihe ịrịba amua ọ bụla a ga-egosi ha karịa ihe ịrịba ama Jona.
Igbo 2006
Ma mb͕e ìgwè madu nēzukọ n'ebe Ọ nọ, Ọ malitere isi, Ọb͕ọ a bu ajọ ọb͕ọ: ọ nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dị ka igwe mmadụ ahụ na-amụba, o bidoro na-ekwu sị, “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe ịrịbama ma ọ dịghị ihe ịrịbama a ga-ezi ya karịa ihe ịrịbama Jona.