Luke 11:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anya bụ iheọkụ nye ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị nile ga-ejupụta nꞌìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nꞌọchịchịrị.
Igbo 2006
Oriọna nke aru-gi bu anya-gi: mb͕e ọ bula anya-gi nēle otù ebe, aru-gi dum juputa-kwa-ra n'ìhè; ma mb͕e ọ bula ọ jọrọ njọ, aru-gi juputa-kwa-ra n'ọchichiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nʼọchịchịrị.