Luke 11:36 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị nile ejupụta nꞌìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ahụ gị ọ bụla agbakwaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ ìhè dị nꞌahụ gị ga-apụta ìhè dị ka a ga-asị na ọ bụ iheọkụ na-enwuzi enwuzi na-enye gị ìhè.”
Igbo 2006
Ya mere, ọ buru na aru-gi dum ejuputa n'ìhè, ghara inwe akuku ọ bula b͕ara ọchichiri, aru ahu dum gējuputa n'ìhè, dika mb͕e oriọna, site n'ìhè-ya nēnwu, nēnye gi ìhè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị niile ejupụta nʼìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ọbụla agbaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè dị ka mgbe ìhè oriọna na-achakwasị gị nʼahụ.”