Luke 11:39 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs gwara onye Farisii ahụ okwu sị, “Ihe na-eme unu ndị Farisii bụ na unu na-asacha azụ iko na efere unu, mee ka ha dị ọcha, ma ime unu jupụtara nꞌanya ukwu na nꞌịhe ọjọọ dị iche iche.
Igbo 2006
Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ub͕u a ka unu onwe-unu, bú ndi-Farisi, nēme ka azú iko na afere di ọcha; ma ime-unu juputara n'ipunara-madu-ihe na ajọ ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Unu ndị Farisii na-asacha azụ iko mmiri na efere, mee ka ọ dị ọcha, ma ime unu jupụtara nʼanya ukwu na nʼihe ọjọọ dị iche iche.