Luke 11:42 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ahụhụ dịrị unu ndị Farisii, nꞌihi na unu na-enye Chineke otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke ego nile unu nwere, ya na otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke akwụkwọ nri ntakịrị dị nꞌubi unu, ma unu ekpọghị ikpe ziri ezi na ịhụ Chineke nꞌanya ihe dị mkpa. Unu kwesịrị inye onyinye unu, ma unu ekwesịghị ịhapụ ime ihe unu kwesịrị ime.
Igbo 2006
Ma ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsi ísì utọ na rue na nkpa-akwukwọ nile, ma unu nagabiga ikpé na ihu-n'anya Chineke: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, nʼihi na unu na-enye otu ụzọ nʼụzọ iri nʼihi mint, na mkpa akwụkwọ na-esi isi ụtọ na mkpa akwụkwọ niile dị iche iche nke ubi, ma leghara ikpe ziri ezi na ịhụnanya nke Chineke anya. Ihe niile ndị a ka unu kwesiri ime nʼelegharaghị ihe ndị ọzọ anya.