Luke 11:46 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs zara ya sị, “Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu! Nꞌihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli site nꞌịtụpụta iwu dị iche iche ha kwesịrị idebe, ma unu onwe unu adịghị agbalị idebe iwu ndị a.
Igbo 2006
O we si, Ahuhu gādi-kwa-ra unu ndi-iwu; n'ihi na unu nēbo madu ibu di ike obubu, ma unu onwe-unu ejighi otù nime nkpisi-aka-unu kpatu ibu ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ sịrị, “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu. Nʼihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli, ma unu onwe unu adịghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka unu, ịmetụ ibu ahụ aka.