Luke 11:51 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ee, ọbara nile a wufuru site nꞌọbara Ebel, ruo nꞌọbara Zakaraya onye e gburu nꞌetiti ebe nchụaja na ebe nsọ. Ee, ana m agwa unu, ọ bụ ndị bi nꞌọgbọ a ga-anata ahụhụ nꞌihi ihe ndị a nile.
Igbo 2006
site n'ọbara Ebel rue ọbara Zakaraia, onye lara n'iyì n'ab͕ata ebe-ichu-àjà na ulo nsọ unu: e, asim unu, agāchọputa ya n'aka ọb͕ọ a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya, onye e gburu nʼetiti ebe ịchụ aja na ebe nsọ. E, agwa m unu, a ga-ajụ ihe banyere ha nʼaka ọgbọ a.