Luke 11:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Nꞌihi na ọ bụ ezie na ọ gaghị agụ nwoke ahụ agụụ isite nꞌihe ndina ya bilie bịa nye enyi ya ahụ ihe ọ rịọrọ, ma ọ ga-ebili meere ya ihe ọ chọrọ nꞌihi na ihere emeghị nwoke ahụ nke bịara nọgidesie ike ịrịọ arịrịọ ahụ.
Igbo 2006
Asim unu, Ọ buru kwa na ọ gaghi-ebili inye ya n'ihi na ọ bu eyì-ya, ma n'ihi aririọ-ya nēnweghi ihere ọ gēbili nye ya ka ihe di ya nkpà ra.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Agwa m unu, ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ enyi ya, kama nʼihi nsogbu ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa.