Luke 12:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ dịghị anya ọtụtụ mmadụ gbara Jisọs gburugburu. Ha dị nnọọ ukwuu mee ka ọtụtụ na-azọ ibe ha ụkwụ. Mgbe ahụ, Jisọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya okwu. Ọ gwara ha sị, “Kpacharanụ anya unu nꞌebe ndị Farisii nọ. Nꞌihi na ha na-eme dị ka ha bụ ndị dị mma, ebe ọ bụ ezie na ha abụghị. Ụdị ihu abụọ ha nwere agaghị adịgide ruo mgbe dị anya.
Igbo 2006
N'oge ahu, mb͕e oké ọtutu ìgwè madu anādighi-aguta aguta zukọrọ, nke mere ka ha nāzọkwasi ibe-ha ukwu, O buru uzọ malite isi ndi nēso uzọ-Ya, Nēzenu ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, nke bu iru-abua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara, nke mere ka ha na-azọ ibe ha ụkwụ. O buuru ụzọ bido ịgwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya unu banyere ihe na-eko achịcha ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ ha.