Luke 12:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Mgbe ha kpọtara unu nꞌụlọ ekpere ndị Juu, ma ọ bụ nꞌihu ndị na-achị achị, ikpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji gọrọ onwe unu.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula ha kpọrọ unu bia n'iru ulo-nzukọ, na ndi-isi, na ndi nāchi isi, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gāgọpu onwe-unu ma-ọbu ihe unu gēji gọpu onwe-unu, ma-ọbu ihe unu gēkwu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe ha ga-akpọbata unu nʼihu ụlọ nzukọ, ndị ọchịchị na ndịisi, unu echegbula onwe unu otu unu ga-esi zaghachi, maọbụ ihe unu ga-aza, maọbụ ihe unu ga-ekwu.