Luke 12:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs na-ekwu okwu a, otu onye nꞌime igwe mmadụ ahụ kpọrọ ya sị, “Onye ozizi, biko gwa nwanne m ka o kenye m ihe ruru m nꞌime akụ na ụba nke nna anyị hapụụrụ anyị mgbe ọ nwụrụ.”
Igbo 2006
Ma otù onye sitere n'igwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, gwa nwa-nnem nwoke ka o kère ihe-nketa-ayi nyem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke nʼihe nketa anyị.”