Luke 12:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
O chere nnọọ echiche banyere ihe ọ ga-eme. Nꞌikpeazụ o tiri mkpu sị, ‘Ahaa! Amaara m ihe m ga-eme. Aga m akwatu ọba ahụ m nwere ugbu a, wuo ọba ọzọ buru ibu. Nꞌụzọ dị otu a aga m ewu ọba nke ga-abanyecha mkpụrụ ubi ndị a.’
Igbo 2006
O we si, Nka ka m'gēme: m'gēweda ọbam, wu kwa nke ka uku; n'ebe ahu ka m'gēkpokọta ọkam nile na ezi ihem nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ya mere ọ sịrị, ‘Ihe m ga-eme bụ nke a, aga m akwatu ọba m, wuo nke ka ya ukwuu, bụ ebe m ga-echekwa mkpụrụ m na ihe ndị ọzọ.