Luke 12:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe m mesịrị ihe ndị a, tinyechaa mkpụrụ ubi a nꞌọba ọhụrụ ahụ, aga m agwa onwe m okwu sị, ‘Enyi, i nwejuola nri ị ga-eri ọtụtụ afọ. Kwụsị ịdọgbu onwe gị nꞌọrụ. Zuru ike. Rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mee ka obi tọọ gị ụtọ. Nchegbu ọ bụla adịkwaghi nye gi.’
Igbo 2006
M'gāsi kwa nkpuru-obim, Nkpuru-obi, i nwere ọtutu ezi ihe edebere nye gi rue ọtutu arọ; nēzu ike, nēri ihe, nāṅu ihe-ọṅuṅu, ka obi nātọ gi utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere aga m agwa mkpụrụobi m, “I nwere ọtụtụ ezi ihe ga-ezuru gị ọtụtụ afọ, nʼihi ya zuru ike, rie, ṅụọ ma nweekwa obi ụtọ.” ’