Luke 12:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Leenụ ụmụ nnụnụ anya. Ha adịghị akụ mkpụrụ nꞌubi, ha adịkwaghị aghọ mkpụrụ site nꞌubi. Ha enweghị ọba ebe ha na-ekpokọta nri. Ma Chineke bụ onye na-azụ ha. Unu dịkwanu mkpa karịa ọtụtụ ụmụ nnụnụ.
Igbo 2006
Tugharinu uche n'ugolo-ọma, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewe kwa ihe ubi; nke nēnweghi ime-ulo ntà ma-ọbu ọba; ma Chineke nāzù ha: ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari anu-ufe nke-uku?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Tuleenụ ugolọma. Ha adịghị akụ maọbụ ghọrọ mkpụrụ ọbụla. Ha enweghị ụlọakụ maọbụ ọba, ma Chineke na-azụ ha nri. Unu ọ dịghị oke ọnụahịa karịa anụ ufe ndị a.