Luke 12:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Leenụ okoko ọhia, ha adịghị arụ ọrụ ọ bụla. Ha adịkwaghị akpara onwe ha akwa ha na-eyi. Ma ka m gwa unu, ọ bụladị eze Solomọn nꞌoge ebube nke ịbụ eze ya, eyighị uwe ọma ọ bụla mara mma dị ka okoko ọhia.
Igbo 2006
Tugharinu uche n'ahihia nke ọhia, otú ha nētó etó: ha adọb͕ughi onwe-ha n'ọlu, ha atughi kwa ogho; ma asim unu, Ọbuná Solomom n'ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Tuleenụ otu okoko ọhịa lili si eto. Ha adịghị arụ ọrụ ọbụla maọbụ tụọ ogho. Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a.