Luke 12:28 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ Chineke na-eme ka ahịhịa maa mma ile anya, ee, ahịhịa nke na-eto taa, nke e nwekwara ike igbutu echi, nke a na-akpọkwa ọkụ ma ọ kpọnwụọ. Ọ bụrụ na Chineke na-eme ka ahịhịa efu maa mma, unu na-eche na ọ gaghị egboro unu mkpa uwe, unu ndị obi abụọ?
Igbo 2006
Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia di n'ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku; Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ pụghị i si otu a chọọ unu mma karịa? Unu ndị okwukwe nta.