Luke 12:33 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Reenụ ihe nile unu nwere nye ndị ogbenye. Nke a ga-eme ka akpa unu, nke dị nꞌelu, ju eju. Akpa ahụ dị nꞌelu epughị epu. Akụ unu dị nꞌeluigwe enwekwaghị ike ifu efu. Onye ohi ọ bụla enwekwaghị ike ịga nꞌebe ahụ zuo ha, nla apụkwaghị iricha ha
Igbo 2006
Renu ihe unu nwere, were ha lua ọlu ebere; merenu onwe-unu àkpà-ego nke nādighi-aka nká, àkù nādighi-agwu agwu n'elu-igwe, ebe onye-ori nādighi-abia nso, ebe nla nādighi-emebi kwa ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.