Luke 12:37 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọṅụ dị ukwuu dị na-eche ụmụ odibo ahụ nna ha ukwu ga-ahụ ka ha mụ anya nọrọkwa na njikere mgbe ọ lọtara. Nꞌezie, nna ha ukwu ga-eso ha nọdụ ala, jikerekwa idoziri ha ihe oriri.
Igbo 2006
Ngọzi nādiri ndi-orù ahu, ndi, mb͕e onye-nwe-ha gābia, ọ gāhu ka ha nēche nche: n'ezie asim unu, na ọ gēke onwe-ya ihe-ọkiké n'úkwù, me ka ha nọdu na nri, ọ gābia kwa jere ha ozi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi.