Luke 12:45 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Kama, ị bụrụ odibo ahụ nke na-asị nꞌime onwe ya, nna m ukwu ga-anọ ọdụ tupuu ọ lọta, ị malite iti odibo ndị nwoke na ndị nwanyị ọzọ i kwesịrị ilekọta anya ihe, i bidokwa na-eso ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-aṅụ mmanya, bụrụ onye mmanya na-egbu,
Igbo 2006
Ma ọ buru na orù ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya ibia; ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndikom na ndinyom nēje ozi aka, na iri ihe-oriri na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅubiga manya ókè;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke.