Luke 12:48 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ma odibo ahụ na-amaghị ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma mee ihe ahụ na-ewetara ndị mere ya ihe otiti, a ga-eti ya ihe ntakịrị. Nꞌihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nꞌaka ya. Nwoke ahụ ndị mmadụ nyere ihe hiri nne nꞌaka, ka ha ga-ele anya ịnata ya ihe hiri nne ha tinyere ya nꞌaka.
Igbo 2006
ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n'aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n'aka idebe, n'aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ.