Luke 12:53 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nna ga-ekpebiri onwe ya ihe ọ na-eche banyere m, nwa ya nwoke ga-enwekwa mkpebi nke ya. Nne na ada ya nwanyị agaghị enwe nkwekọta ọ bụla, otu a kwa nwụnye nwa agaghị anabatakwa ihe ọ bụla nne di ya kwuru dị ka eziokwu.”
Igbo 2006
Agēkewa ha, nna megide nwa-ya nwoke, nwa-nwoke megide kwa nna-ya; nne megide nwa-ya nwanyi, nwa-nwanyi megide kwa nne-ya; nne di megide nwunye nwa-ya, nwunye nwa megide kwa nne di-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ga-ekewa; nna megide nwa ya nwoke, nwa nwoke ga-emegidekwa nna ya, nne megide nwa ya nwanyị, nwa nwanyị megidekwa nne ya, nne di megide nwunye nwa ya, nwunye nwa megide nne di ya.”