Luke 12:54 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị lee igwe mmadụ ahụ anya sị, “Mgbe ọ bụla unu lere anya hụ igwe ojii nꞌọdịda anyanwụ, unu na-asị ‘Mmiri ga-ezo taa.’ Mmiri na-ezokwa.
Igbo 2006
O we si kwa ìgwè madu nile, Mb͕e ọ bula unu huru igwe-oji ka o si n'Ọdida-anyanwu nārigo, ngwa ngwa unu nāsi, Nshansha-miri nābia; o were mee otua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe unu hụrụ urukpu ojii ka ọ na-ebili nʼọdịda anyanwụ, unu na-eme ngwangwa sị, ‘Mmiri ga-ezo,’ ọ na-ezokwa.