Luke 12:58 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ka m dọọ unu aka na ntị, ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nꞌihu onye ikpe, gbalịsie ike hụ na gị na ya kpere udo tupuu ikpe gị na ya eruo ụlọ ikpe. Ma i meghị otu a, ọkaikpe ga-ama gị ikpe, tinye gị nꞌụlọ mkpọrọ.
Igbo 2006
N'ihi na mb͕e gi na onye nēkuru gi ga ikpé nāga n'iru onye-isi, mesie ike ipu n'aka-ya n'uzo; ka ọ ghara idọkpuru gi nye onye-ikpé ma eleghi anya, onye-ikpé gārara kwa gi nye n'aka onye nēnye ndi-nmehie ahuhu, onye ahu nēnye ndi nmehie ahuhu gātubà kwa gi n'ulo-nkpọrọ
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nʼihu ọkaikpe, gbalịsie ike ka gị na ya kpezie nʼụzọ, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-akpọpụ gị nʼihu onye ọkaikpe, ma eleghị anya ọkaikpe ahụ ga-arara gị nye nʼaka ọkaikpe ukwu, ọkaikpe ukwu ga-ararakwa gị nye nʼaka onye na-eje ozi nʼụlọikpe, bụ onye ga-etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.