Luke 13:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌime ụlọ ahụ, o nwere otu nwanyị bịara, nke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Mmụọ ọjọọ a emeela ka nwanyị a nọọ nꞌọrịa afọ iri na asatọ. Kemgbe oge ahụ, nwanyị a na-ehu ehu mgbe ọ bụla ọ na-aga ije, o nweghị ike iguzo kwem.
Igbo 2006
Ma le, otù nwanyi nke nwere mọ nke nēme ka aru-ya ghara idi ike arọ iri na asatọ; o rudakwara ala, ọ pughi kwa iweli onwe-ya elu ma-ọli.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem.