Luke 13:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nꞌihi na Jisọs gwọrọ nwanyị a nꞌụbọchị izuike. O biliri gwa ndị mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nꞌime izu ụka mgbe mmadụ kwesịrị ịrụ ọrụ. Ọ bụrụ na ahụ esighị gị ike, ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka a gwọọ gị, bịa nꞌime ụbọchị isii ndị a. Abịakwala nꞌụbọchị izuike ka a gwọọ gị!”
Igbo 2006
Ma onye-isi ulo-nzukọ ahu, ebe iwe were ya nke-uku n'ihi na Jisus mere ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ọ zara, si ìgwè madu ahu, Ubọchi isi di nke madu aghaghi ilu ọlu nime ha: ya mere, bianu nime ha ka eme ka aru-unu di ike, unu abiakwala n'ubọchi-izu-ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.”