Luke 13:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs zara nwoke ahụ sị, “Ị bụ nnọọ onye ihu abụọ! Ị na-achọ ịkọwa na gị onwe gị adịghị arụ ọrụ ọ bụla nꞌụbọchị izuike? Ị̀ naghị atọpụ ehi gị ma ọ bụ inyinya ibu gị ebe i kenyere ha, duru ha gaa nꞌebe ha ga-enweta mmiri ha na-aṅụ nꞌụbọchị izuike?
Igbo 2006
Ma Onye-nwe-ayi zara ya, si, Ndi-iru-abua; onye ọ bula nime unu, ọ̀ dighi-atọpu ehi-ya ma-ọbu inyinya-ibu-ya n'ulo anu-ulo n'ubọchi-izu-ike, duru ya ga ime ka ọ ṅua miri?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike?