Luke 13:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a ị̀ na-ekwu na m mere ihe ọjọọ nꞌihi na m mere ka ahụ dị nwanyị a bụ onye Juu mma? Èmere m ihe ọjọọ nꞌihi na m tọpụrụ nwanyị a site nꞌagbụ ekwensu kere ya kemgbe afọ iri na asatọ nꞌụbọchị izuike?”
Igbo 2006
Ma nwanyi a, ebe ọ bu nwa Abraham, onye Setan kere ab͕u, le, arọ iri na asatọ, ò kwesighi ka atọpu ya n'ab͕ú a n'ubọchi-izu-ike?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?”