Luke 13:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe onye nwe ụlọ ahụ biliri mechie ọnụ ụzọ ya, ọ dịkwaghị onye ọ bụla nwere ike ịbanyekwa. Mgbe ahụ ọ bụrụ unu anọdụ nꞌezi kụọ aka nꞌọnụ ụzọ na-arịọ arịrịọ sị, ‘Onyenwe anyị biko megheere anyị ụzọ,’ ọ ga-aza sị, ‘Amaghị m ndị unu bụ. Amakwaghị ebe unu si bịa.’
Igbo 2006
Mb͕e Nna-nwe-ulo gēbiliwori, mechi kwa uzọ-Ya, unu we malite iguzo n'èzí, na iku aka n'ọnu-uzọ ahu, si Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ; ma Ọ gāza, si unu, Amataghim unu, ebe unu si bia;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’