Luke 13:26 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Nꞌoge ahụ unu ga-azaghachi sị, ‘Onyenwe anyị, ọ bụ anyị na gị soro rikọọ nri. Ọ bụkwa nꞌokporo ụzọ dị nꞌakụkụ ụlọ anyị ka ị nọ zie ndị mmadụ ihe.’
Igbo 2006
mb͕e ahu ka unu gāmalite isi, Ayi riri ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Gi, I zíkwara ihe n'amá-ayi;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’