Luke 13:31 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe oge nta gasịrị ụfọdụ ndị si nꞌotu ndị Farisii bịara nꞌebe Jisọs nọ gwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na ị hụrụ ndụ gị nꞌanya, sitekwa nꞌebe a pụọ ngwangwa, nꞌihi na Herọd na-achọsi ike igbu gị.”
Igbo 2006
N'oge hour ahu ndi-Farisi ufọdu biakutere Ya, si Ya, Pua, si n'ebe a la: n'ihi na Herod nāchọ ib͕u Gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge awa ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya sị ya, “Si nʼebe a pụọ, nʼihi na Herọd na-achọ igbu gị.”