Luke 13:32 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Jisọs zara ha sị, “Gaanụ gwa anụ ụrụ ahụ na m kwuru sị, na taa na echi, aga m anọgide na-arụ ọrụ m na-arụ ịchụpụ mmụọ ọjọọ na ịgwọ ndị ọrịa. Gwakwanụ ya na nwanne echi aga m arụcha ọrụ m.
Igbo 2006
O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n'ubọchi nke-atọ emekwam ka M'zu okè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Gaa gwaranụ m nkịta ọhịa ahụ, lee, ana m achụpụ mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị ọrịa taa na echi, ma nʼụbọchị nke atọ ka m ga-arụcha ọrụ m.